Psalms 90

Nchịkọta nke anọ

Abụ Ọma 90–106

Ekpere Mosis, bụ onyeozi Chineke.

Ebighị ebi Chineke na ịdị mkpụmkpụ nke ndụ mmadụ

1O Onyenwe anyị, ebe obibi ka gị onwe gị bụrịị nye anyị
nʼọgbọ niile.
2Tupu e kee ugwu niile,
na tupu a kpụọ ụwa na elu ụwa,
siterị na mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi, ị bụ Chineke.

3Ị na-eme ka mmadụ laghachi bụrụ aja
mgbe i kwuru okwu sị, “Unu ụmụ mmadụ, laghachi bụrụ aja.”
4Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị;
ha dịka ụnyaahụ gafere agafe
maọbụ ka otu awa nke anyasị. b
5Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ;
ha dịka ahịhịa ọhụrụ nke na-epupụta nʼisi ụtụtụ,
6ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ,
ma nʼanyasị, ọ na-akpọnwụ ma-achanwụkwaa.

7E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị;
anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị.
8Ị gbasaala njehie anyị niile nʼihu gị.
Ị na-ahụzukwa mmehie nzuzo anyị niile.
9Ogologo ụbọchị anyị niile na-agabiga nʼoke iwe gị;
afọ ndụ anyị nke fọdụrụ ka anyị na-ebi dịka okwu e ji nwayọọ kwuo na mwute.
10Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa,
maọbụ afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na ike anyị adịgide,
ma otu ọ dị, nke a ga-asị na ọ bụ ya kachasị mma na-ejupụta na nsogbu na ịsụ ude,
nʼihi na ha na-agabiga ọsịịsọ, anyị onwe anyị na-efelakwa.
11Onye pụrụ ịghọta ịdị ike nke oke iwe gị?
Nʼihi na oke iwe gị dị ukwuu dịka ịtụ egwu kwesiri gị si dị ukwuu.
12Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ,
ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.

13O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị?
Meere ndị ohu gị ebere.
14Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ,
ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile.
15Mee ka anyị nwee obi ụtọ, nke ọnụọgụgụ ụbọchị ya ga-adịkwa ka ọnụọgụgụ ụbọchị niile ị tara anyị ahụhụ,
ka ọnụọgụgụ afọ ya dịkwa ka ọnụọgụgụ afọ niile anyị hụrụla nsogbu.
16Kwere ka ndị ohu gị hụ ọrụ gị dị iche iche,
ka ụmụ ha hụkwa ịma mma gị.

17Ka ihuọma Chineke, Onyenwe anyị dịkwasị anyị;
mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike,
e, mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike.
Copyright information for IboBIU